Isaiah 43

Onye nzọpụta ndị Izrel nwere

1Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
bụ onye kere gị, Jekọb,
na onye kpụrụ gị Izrel,
“Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị.
Akpọọla m gị aha, ị bụkwa nke m.
2Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe,
aga m anọnyere gị.
Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo,
agaghị m ekwe ka o bufuo gị.
Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ,
ọ gaghị eregbu gị.
Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.
3Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel.
Ewerela m Ijipt
na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị.
4Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m,
ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya,
aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị.
Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ.
5Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị.
Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ
na nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị.
6Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha,
‘Hapụnụ ha ka ha laa,
unu egbochikwala ha.’
Hapụnụ ndị m ka ha site nʼala niile dị anya nke nsọtụ ụwa lọghachi,
7onye ọbụla nke a na-akpọ aha m,
onye m kere nʼihi otuto m,
onye m kpụrụ, ma meekwa.”

8Kpọpụtanụ ha, bụ ndị ahụ nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ,
ndị nwere ntị ma ha adịghịkwa anụ ihe.
9Mba niile dị iche iche ezukọtala,
mmadụ niile agbakọtakwala.
Onye nʼime chi ha kwuru na ihe dị otu a ga-eme,
onye kwa kwuru ihe ndị a mere nʼoge gara aga?
Ka ha kpọbata ndị akaebe ha izipụta na ihe ha kwuru ziri ezi,
ka ndị ọzọ nụ ya ma sị na, “Ọ bụ eziokwu.”
10“Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“bụrụkwa ndị ohu m họpụtara,
ka unu mara m, ma kwerekwa na m,
ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ.
Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị,
ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ.
11Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị,
ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m.
12Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya,
mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu.
Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
13“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke.
Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka.
Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?”

Ebere Onyenwe anyị, na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel

14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel.
“Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn
budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ,
nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi.
15Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Onye nsọ gị,
onye kere Izrel, Eze unu.”

16Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
bụ onye ahụ kwara ụzọ nʼime osimiri,
nke mere ka okporoụzọ dịrị nʼime oke osimiri.
17Nke na-eme ka ụgbọ ndị agha dị ukwuu, na ịnyịnya pụta,
ndị agha na ụsụ ha achịkọtara ọnụ,
mee ha ka ha dinaa nʼebe ahụ, ghara ibilitekwa ọzọ,
dịka ha bụ ọkụ ogho oriọna e menyụrụ emenyụ.
18“Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga;
unu atụgharịkwala uche unu na ha.
19Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime.
Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya?
Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara,
na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu.
20Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m,
nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m,
nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara,
meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu,
nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara.
21Ndị m kpụrụ nye onwe m,
ka ha kọsaa akụkọ otuto m.

22“Ma unu akpọkughị m, Jekọb,
kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel.
23I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ,
maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m.
O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka,
maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ.
24Unu ewetabereghị m ụda kalamus na-esi isi ụtọ,
maọbụ were abụba anụ nke aja unu niile mee ka obi tọọ m ụtọ.
Kama ọ bụ naanị mmehie unu ka unu na-ebokwasị m,
unu ejirila ajọ omume unu mee ka ike gwụsịa m.

25“Mụ onwe m, ọ bụ naanị mụ onwe m, bụ onye na-ehichapụ mmehie unu.
Ana m emekwa ya nʼihi na ọ dị m mma nʼobi ime ya.
Agakwaghị m echeta mmehie unu ọzọ.
26Chetara m ihe gara aga,
ka anyị rụrịta ụka nʼetiti onwe anyị,
doo okwu gị nʼusoro igosi na ị bụ onye ikpe na-amaghị.
27Site na mmalite, nna nna unu ha mehiere megide m.
Ndị m dunyere ka ha kuziere unu ihe nupukwara isi megide m.
28Ya mere, m ji menye ndị a maara aha ha nʼụlọnsọ ihere.
Enyefere m Jekọb ka ọ bụrụ onye ewezugara nye mbibi,
nyekwa Izrel ka ọ bụrụ ihe mkparị.
Copyright information for IboBIU